Jump to content

Okene

Shí Wikipedia, njikotá édémédé nke onyobulạ
Okene

Okene bụ obodo dị na steeti Kogi nke Naijiria . Obodo a gbadoro ụkwụ na mpaghara ọchịchị ime otu aha. Okene na-aga n'okporo ụzọ A2 . Ọ nwere mpaghara  km 2 narị atọ na iri abụo na asatọ na ọnụ ọgụgụ mmadụ dị puku narị atọ na iri abụo,narị abụọ na iri isii na ngụkọ afọ 2006. [1]

Ndị kacha bụrụ ndị Ebira nke etiti Naijiria na-asụkwa bụ asụsụ Ebira .

Koodu nzipu ozi nke mpaghara ahụ bụ narị abụọ na iri isii na anọ . [2]

Ndị mmadụ

[dezie | dezie ebe o si]

Okene bụ ebe amụrụ onye ọkpụkpọ egwuregwu Hockey mba Amerika na atụmanya National Hockey Akim Aliu . [3] Onye Naijiria ọzọ a ma ama sitere na Okene bụ Injinia Joseph Makoju, onye bụbu onye isi njikwa ụlọ ọrụ Igwe n'ekesa ọkụ nke mba Naijiria ma bụrụkwa onye ndụmọdụ nkwanye ugwu nye Onye isi ọchịchị na ọkụ eletrik na onye ndụmọdụ nsọpụrụ nke Onye isi ala / Otu atụmatụ isi ụlọ ọrụ Dangote . Okene bụ ebe amụrụ Gọvanọ Yahaya Bello na Gọvanọ ahọpụtara nke Kogi steeti bụ Ahmed Usman Ododo . Onye omere ama ama na onye ọchụnta ego Mercy Johnson sikwa Okene. [4]

Agụmakwụkwọ

[dezie | dezie ebe o si]

Nnukwu ụlọ okacha mmụta Akwụkwọ nke akpọrọ Federal College of Education dị na Okene n'akụkụ okporo ụzọ Okene- gara Lokoja . Enwekwara ogige satịlaịtị nke Kogi State Polythecnic. Enwere ụlọ akwụkwọ dị iche iche n'obodo ahụ, gụnyere ụlọ akwụkwọ sekọndrị dị ka Abdulaziz Atta Memorial College Okene (AAMCO), Ụlọ akwụkwọ sekondiri okpuru ọchịchị ime obodo Ohiana (LGSS), Ụlọ mmụta asụsụ Arabic na Islamic Okene (CAISO), Otú ụlọ akwukwọ Solardad , dị na nso nso a. GRA Okene, Ụlọ akwụkwọ ndi ntolite Nozịrị na praịmarị Samaritan, nke dị na Ozuwaya n'akụkụ Kekere Guest Palace Okene, na ọtụtụ ụlọ akwụkwọ ndị ọzọ ama ama. [5]

Akụkọ ihe mere eme

[dezie | dezie ebe o si]

Ọ bụ n'afọ 1976 ka e mebere mpaghara ọchịchị Okene site na ngalaba Ebira nke oge ahụ site n'aka ndị nlekọta nke Onye isi ala Olusegun Obasanjo, na-esote mgbanwe ọchịchị ime obodo nke afọ 1976. Ndị Okpuru ọchịchị ime obodo Ajaokuta na Ogori-Magongo sitere na okpuru ọchịchị ime obodo Okene ochie na afọ 1991 na afọ 1996 n'otu n'otu. Ndị obodo Okene bụ ndị Ebira Tao nke ezumezu isi ụlọ ọrụ etiti nke Kogi steeti.

Ekwenyere na ha siri na Jukun kwaga na steeti Taraba ugbu a wee kwụsịtụ obere oge na Idah tupu ha akwaga ebe ha nọ ugbu a. Okpuru ọchịchị ime obodo Okene dị ugbu a bụ mpaghara Okene na Okengwe. Enwere ngalaba iri na otu n'ime ọchịchị ime obodo, ya bụ Bariki, Otutu, Orietesu, Lafia/Obessa, Okene-Eba, Idoji, Onyukoko, Obehira-Eba, Obehira-Uvete, Abuga/Ozuja na Upogoro/Odenku ward. Ndị bi na ya bụ ndị Alakụba, mana ndị otu Ndị Kraịst pere mpe dịkwa. Ruo n'ókè dị ukwuu, e nwere ngwakọta nke ọdịnala na okpukpere chi ebe ọ bụ nanị mmadụ ole na ole na-eleda anya ka na-ekpe nanị okpukpe ọdịnala.

Otu n'ime ihe nkiri kachasị ewu ewu n'obodo ahụ bụ Obí Azad, nke bụ ihe onwunwe nke Ohinoyi (Eze) nke Ebiraland, Dr. Ado Ibrahim Atta, bụ onye nwụgoro anwụ ugbu a. [6]

Ihu igwe

[dezie | dezie ebe o si]

Edemsibia

[dezie | dezie ebe o si]
  1. HASC, population, area and Headquarters Statoids
  2. Post Offices- with map of LGA. NIPOST. Archived from the original on October 7, 2009. Retrieved on 2009-10-20.
  3. Akim Aliu's profile at hockeydb.com
  4. Mercy Johnson Biography: Who Is the Star Actress, Where is She From and How Old Is She?. buzznigeria.com. Retrieved on 2023-06-23.
  5. The top 10 schools near Okene (page 2) (en-NG). schools.heyplaces.com.ng. Retrieved on 2022-10-03.
  6. Ohinoyi of Ebiraland dies at 95. Channels TV. Retrieved on July 3, 2024.